Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 31:27-30 Bible Nso (IGBOB)

27. N'ihi na mu onwem amawo nnupu-isi-gi, na nkwesi-olu-ike-gi: le, mb͕e m'nānọ ndu n'etiti unu ta, unu aburuwo ndi nānupu isi n'okpuru Jehova; ùnu gēsi aṅa ghara inupu isi kari nke-uku mb͕e ọnwum gasiri?

28. Kpọkọtaranum ndi-okenye nile nke ebo nile unu, na ndi-odozi-okwu-unu, ka m'kwu kwa okwu ndia na nti-ha, me ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide ha.

29. N'ihi na amawom na mb͕e ọnwum gasiri unu gēbibi onwe-unu nke-uku, wezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke m'nyeworo unu n'iwu; ihe ọjọ gādakwasi kwa unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia; n'ihi na unu gēme ihe ọjọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe n'omume aka-unu.

30. Moses we kwue na nti nkpọkọta nile nke Israel okwu nile nke abù a, rue mb͕e ekwuzuru ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 31