Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 31:26-28 Bible Nso (IGBOB)

26. Were akwukwọ iwu a, tiye ya n'akuku ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, ka o we di n'ebe ahu ibu ihe-àmà megide gi.

27. N'ihi na mu onwem amawo nnupu-isi-gi, na nkwesi-olu-ike-gi: le, mb͕e m'nānọ ndu n'etiti unu ta, unu aburuwo ndi nānupu isi n'okpuru Jehova; ùnu gēsi aṅa ghara inupu isi kari nke-uku mb͕e ọnwum gasiri?

28. Kpọkọtaranum ndi-okenye nile nke ebo nile unu, na ndi-odozi-okwu-unu, ka m'kwu kwa okwu ndia na nti-ha, me ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 31