Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 31:19-30 Bible Nso (IGBOB)

19. Ma ub͕u a, Derenu onwe-unu abù a, gi zí kwa ya umu Israel: tiye ya n'ọnu-ha, ka abù a we burum ihe-àmà megide umu Israel.

20. N'ihi na mb͕e M'gēmewori ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya; mb͕e ha gēriwo-kwa-ri ihe, afọ eju kwa ha, ha we ma abuba; ha gēche kwa chi ọzọ iru, fè ha òfùfè, we leliam anya, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum.

21. O gēru kwa, mb͕e ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta ha, na abù a gāb͕a àmà n'iru ha dika ihe-àmà; n'ihi na agaghi-echezọ ya pua n'ọnu nkpuru-ha: n'ihi na amawom ncheputa-ha nke ndi ahu nēme ta, tutu Mu eme ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru iyi inye ha.

22. Moses we de abù a n'akwukwọ n'ubọchi ahu, zí kwa ya umu Israel.

23. O we nye Joshua nwa Nun iwu, si, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka umu Israel ba n'ala ahu nke M'ṅuru ha iyi inye ha: Mu onwem gānọye-kwa-ra gi.

24. O rue, mb͕e Moses debisiri okwu nile nke iwu a n'akwukwọ, rue mb͕e edezuru ha,

25. na Moses nyere ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iwu, si,

26. Were akwukwọ iwu a, tiye ya n'akuku ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, ka o we di n'ebe ahu ibu ihe-àmà megide gi.

27. N'ihi na mu onwem amawo nnupu-isi-gi, na nkwesi-olu-ike-gi: le, mb͕e m'nānọ ndu n'etiti unu ta, unu aburuwo ndi nānupu isi n'okpuru Jehova; ùnu gēsi aṅa ghara inupu isi kari nke-uku mb͕e ọnwum gasiri?

28. Kpọkọtaranum ndi-okenye nile nke ebo nile unu, na ndi-odozi-okwu-unu, ka m'kwu kwa okwu ndia na nti-ha, me ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide ha.

29. N'ihi na amawom na mb͕e ọnwum gasiri unu gēbibi onwe-unu nke-uku, wezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke m'nyeworo unu n'iwu; ihe ọjọ gādakwasi kwa unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia; n'ihi na unu gēme ihe ọjọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe n'omume aka-unu.

30. Moses we kwue na nti nkpọkọta nile nke Israel okwu nile nke abù a, rue mb͕e ekwuzuru ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 31