Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 30:9-20 Bible Nso (IGBOB)

9. Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i babiga uba okè n'omume nile nke aka-gi, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, bayere ezi ihe: n'ihi na obi gātọ kwa Jehova utọ ọzọ n'aru gi ime gi nma, dika obi tọrọ Ya utọ n'aru nna-gi-hà:

10. mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke edeworo n'akwukwọ iwu a; mb͕e i were obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, chigharikute Jehova, bú Chineke-gi.

11. N'ihi na ihe a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi 'niwu ta, ọ bughi ihe kariri gi ime ka ọ bu, ọ bughi kwa ihe diri gi anya ka ọ bu.

12. Ọ dighi n'elu-igwe, ka i we si, Ònye gārigoro ayi n'elu-igwe, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya?

13. Ọ dighi kwa n'ofè oké osimiri, ka i we si, Ònye gāgabigara ayi n'ofè oké osimiri, wetara ayi ya, me ka ayi nuru ya, ka ayi we me ya?

14. Kama okwu ahu di gi ezi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi, ka i we me ya.

15. Le, etiyewom n'iru gi ta ndu na ezi ihe, na ọnwu na ihe ọjọ;

16. n'ihi na mu onwem nēnye gi iwu ta ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ije ije n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, ka i we di ndu, ba kwa uba, ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzi kwa gi n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.

17. Ma ọ buru na obi-gi echigharia, i we ghara inu anu, kama eduhie gi, we kpọ isi ala nye chi ọzọ, we fè ha òfùfè;

18. egosiwom unu ta, na unu aghaghi ila n'iyì; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nāgabiga Jọdan ibà ka i nweta ya.

19. Emewom ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide unu ta, na ọ bu ndu na ọnwu, ngọzi ahu na nkọcha ahu, ka m'tiyeworo n'iru gi: gi rọrọ kwa ndu, ka i we di ndu, gi onwe-gi na nkpuru-gi:

20. ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ige nti olu-Ya, na irapara n'aru Ya: n'ihi na Ya onwe-ya bu ndu-gi, na ogologo nke ubọchi-gi: ka i we biri n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, inye ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 30