Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 29:23-29 Bible Nso (IGBOB)

23. mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n'iwe-Ya na n'ọnuma-Ya:

24. ọbuná mba nile ahu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka otú a? gini bu isi idi-ọku iwe uku a?

25. Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, nke Ya na ha b͕ara mb͕e O mere ka ha si n'ala Ijipt puta;

26. ha we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ha, bú chi nke ha nāmaghi, nke Ọ nēkèghi n'òkè nye ha:

27. iwe Jehova we di ọku megide ala nka, ime ka nkọcha nile nke edeworo n'akwukwọ a biakwasi ya:

28. Jehova we ropu ha n'ala-ha n'iwe, na'ọnuma, na n'oké iwe, we tubà ha n'ala ọzọ, otú ọ di ta.

29. Ihe nile ezoro ezo diri Jehova, bú Chineke-ayi: ma ihe nile ekpughere ekpughe diri ayi, di-kwa-ra umu-ayi rue mb͕e ebighi-ebi, ka ayi we me okwu nile nke iwu a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 29