Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 29:23-25 Bible Nso (IGBOB)

23. mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n'iwe-Ya na n'ọnuma-Ya:

24. ọbuná mba nile ahu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka otú a? gini bu isi idi-ọku iwe uku a?

25. Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, nke Ya na ha b͕ara mb͕e O mere ka ha si n'ala Ijipt puta;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 29