Jehova gēme kwa ka i were ub͕ọ laghachi n'Ijipt, n'uzọ nke m'siri gi, I gaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli: unu gēwere kwa onwe-unu renye ndi-iro-unu n'ebe ahu ibu orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, ma onye-ọb͕ub͕a agaghi-adi.