Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 28:48-55 Bible Nso (IGBOB)

48. i gēfè kwa ndi-iro-gi, ndi Jehova gēzì megide gi, n'agu, na n'akpiri-ikpọ-nku, na n'ib͕a-ọtọ, na n'ukọ ihe nile: ọ gētiye kwa yoke ígwè n'olu-gi, rue mb͕e ọ gēkpochapu gi.

49. Jehova gēsi n'ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bú mba nke i nānughi asusu-ya;

50. mba nke nwere iru di egwu, nke nāhughi okenye iru-ọma, nke nēmeghi kwa nwata amara:

51. ọ gēri kwa nkpuru nke anu-ulo-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, rue mb͕e agēkpochapu gi: ọ gaghi-ekwe kwa ka ọka, na manya-vine ọhu, na manu, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, fọduru gi, rue mb͕e ọ gēme ka i la n'iyi.

52. Ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, rue mb͕e mb͕idi-gi nile gāda, bú mb͕idi ahu di elu nke ewusi-kwa-ra ike, nke gi onwe-gi nātukwasi obi na ha, n'ala-gi nile: ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

53. I gēri kwa nkpuru nke afọ-gi, bú anu-aru umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-gi nākpab͕u gi.

54. Nwoke nke di nro n'etiti gi, nke di kwa pekepeke nke-uku, anya-ya gājọ njọ n'aru nwa-nne-ya, na n'aru nwunye nke obi-ya, na n'aru umu-ya fọduru nke ọ kwere ka ha fọdu:

55. ọ we ghara inye onye ọ bula nime ha ufọdu nime anu-aru umu-ya nri ọ ga-eri, n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula fọduru ya; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 28