Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 28:46-53 Bible Nso (IGBOB)

46. ha gādikwasi kwa gi ibu ihe-iriba-ama na ibu ihe-ebube, dikwasi kwa nkpuru-gi-rue mb͕e ebighi-ebi:

47. n'ihi na i fèghi Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè n'ọṅu, na n'obi-utọ, n'ihi iba-uba nke ihe nile:

48. i gēfè kwa ndi-iro-gi, ndi Jehova gēzì megide gi, n'agu, na n'akpiri-ikpọ-nku, na n'ib͕a-ọtọ, na n'ukọ ihe nile: ọ gētiye kwa yoke ígwè n'olu-gi, rue mb͕e ọ gēkpochapu gi.

49. Jehova gēsi n'ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bú mba nke i nānughi asusu-ya;

50. mba nke nwere iru di egwu, nke nāhughi okenye iru-ọma, nke nēmeghi kwa nwata amara:

51. ọ gēri kwa nkpuru nke anu-ulo-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, rue mb͕e agēkpochapu gi: ọ gaghi-ekwe kwa ka ọka, na manya-vine ọhu, na manu, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, fọduru gi, rue mb͕e ọ gēme ka i la n'iyi.

52. Ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, rue mb͕e mb͕idi-gi nile gāda, bú mb͕idi ahu di elu nke ewusi-kwa-ra ike, nke gi onwe-gi nātukwasi obi na ha, n'ala-gi nile: ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

53. I gēri kwa nkpuru nke afọ-gi, bú anu-aru umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-gi nākpab͕u gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 28