Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 27:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Moses na ndi-okenye Israel we nye ndi Israel iwu, si, Debe ihe nile enyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.

2. Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu mb͕e unu gāgabiga Jọdan rue ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, na i gēguzoro onwe-gi nkume uku ọtọ, were ihe-ntechi techie ha:

3. i gēdekwasi kwa ha okwu nile nke iwu a, mb͕e i gabigasiri; ka i we ba n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, dika Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu.

4. Ọ gēru kwa, mb͕e unu gabigasiri Jọdan, na unu gēguzo nkume ndia ọtọ, nke mu onwem nēnye unu n'iwu, n'ugwu Ibal, i gēwere kwa ihe-ntechi techie ha.

5. I gēwu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú ebe-ichu-àjà nkume: emela ka ihe-ọlu ígwè ga n'elu ha.

6. I gēji nkume zuru okè wue ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: i gēsure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, àjà-nsure-ọku n'elu ya:

7. i gāchu kwa àjà-udo, ri kwa ihe n'ebe ahu; i gāǹuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi.

8. I gēdekwasi kwa na nkume ndia okwu nile nke iwu a, agātu akika ha nke-ọma.

9. Moses na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we gwa Israel nile okwu, si, Nọdu du, ge kwa nti, Israel; ubọchi ta ka i ghọworo Jehova, bú Chinek-gi, otù ndi.

10. I gēge kwa nti olu Jehova, bú Chineke-gi, me ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.

11. Moses we nye ndi Israel iwu n'ubọchi ahu, si,

12. Ndia gēguzo n'elu ugwu Geraizim igọzi ndi Israel, mb͕e unu gabigasiri Jọdan; Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Josef, na Benjamin:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 27