Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 26:11-18 Bible Nso (IGBOB)

11. i gāṅuri kwa ọṅu n'ezi ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi, nye kwa ulo-gi, gi onwe-gi, na onye Livai, na ọbìa nke nọ n'etiti gi.

12. Mb͕e i gēnyebìwori otù uzọ n'uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n'arọ nke-atọ, bú arọ nke inye otù uzọ n'uzọ iri, i gēnye kwa ya onye Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, ka ha we rie nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, afọ ewe ju ha;

13. i gāsi kwa n'iru Jehova, bú Chineke-gi, Ekpochapuwom ihe nsọ ahu n'ulom, ọzọ kwa, enyewom ya ndi Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, dika ihe nile I nyere n'iwu si di nke I nyerem n'iwu: agabigaghm ihe nile I nyere n'iwu, echezọghkwam:

14. erighm ihe sitere na ya n'iru-újúm, ekpochapughkwam ihe sitere na ya n'adighi-ọcha, enyeghkwam ihe sitere na ya bayere onye nwuru anwu: egewom nti olu Jehova, bú Chinekem, emewom dika ihe nile si di nke I nyeworom n'iwu.

15. Si n'ebe-obibi nsọ Gi, si n'elu-igwe, le anya, gọzie ndi-Gi, bú Israel, na ala-ubi ahu nke I nyeworo ayi, dika I ṅuru nna-ayi-hà iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

16. Ubọchi ta ka Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi iwu ime ukpuru ndia na ikpé ndia: i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, debe ha, me kwa ha.

17. Jehova ka i meworo ka Ọ si ta na Ọ gāburu gi Chineke, na i gēje kwa ije n'uzọ-Ya nile, debe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, ge kwa nti olu-Ya:

18. Jehova emewo kwa ka i si ta na i gāburu Ya ndi nke aka Ya, dika Ọ gwaworo gi okwu, na i gēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 26