8. Ndi-okenye obodo-ya gākpọ kwa ya, gwa ya okwu: ma asi na o guzo, si, Ọ tọghm iluru ya na nwunye;
9. nwunye nwa-nne-ya gābiaru ya nso n'anya ndi-okenye, tọpu akpukpọ-ukwu-ya n'ukwu-ya, b͕asa ya asọ n'iru, za ya, si, Otú a ka agēme nwoke ahu nke nēwulighi ulo nwa-nne-ya.
10. Agākpọ kwa aha-ya n'Israel, Ulo nke onye atọpuru akpukpọ-ukwu-ya.
11. Mb͕e ndikom gālurita ọ̀gù, otù onye na ibe-ya, ma nwunye nke otù nime ha abiaru nso inaputa di-ya n'aka onye nēti ya ihe, asi na ọ setipu aka-ya, we jide ya na nkpa-amu-ya:
12. i gēbipu kwa aka-ya, anya-gi agaghi-eme ebere.
13. Enwela n'àkpà-gi uzọ nkume-isì-ihe abua, nke-uku na nke-ntà.