Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 25:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. Ndi-okenye obodo-ya gākpọ kwa ya, gwa ya okwu: ma asi na o guzo, si, Ọ tọghm iluru ya na nwunye;

9. nwunye nwa-nne-ya gābiaru ya nso n'anya ndi-okenye, tọpu akpukpọ-ukwu-ya n'ukwu-ya, b͕asa ya asọ n'iru, za ya, si, Otú a ka agēme nwoke ahu nke nēwulighi ulo nwa-nne-ya.

10. Agākpọ kwa aha-ya n'Israel, Ulo nke onye atọpuru akpukpọ-ukwu-ya.

11. Mb͕e ndikom gālurita ọ̀gù, otù onye na ibe-ya, ma nwunye nke otù nime ha abiaru nso inaputa di-ya n'aka onye nēti ya ihe, asi na ọ setipu aka-ya, we jide ya na nkpa-amu-ya:

12. i gēbipu kwa aka-ya, anya-gi agaghi-eme ebere.

13. Enwela n'àkpà-gi uzọ nkume-isì-ihe abua, nke-uku na nke-ntà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 25