Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 25:5-8 Bible Nso (IGBOB)

5. Mb͕e umu-nne ndikom gēbikọ, otù nime ha ewe nwua, ma ọ nweghi nwa-nwoke, nwunye onye ahu nke nwuru anwu agaghi-aburu nwoke ala ọzọ nwunye n'èzí: nwa-nne di-ya gābakuru ya, luru ya n'onwe-ya na nwunye, we lua ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe ọ nọ.

6. Ọ gēru kwa, na ọkpara ọ gāmu gānọchi n'aha nke nwa-nne-ya nke nwuru anwu, ka aghara ihichapu aha-ya n'Israel.

7. Ma ọ buru na ọ tọghi nwoke ahu iluru nwunye nwa-nne-ya na nwunye, nwunye nwa-nne-ya gārigoru ọnu-uzọ-ama, jekuru ndi-okenye, si, Nwa-nne dim nāju ime ka aha biliere nwa-nne-ya n'Israel, o kweghi ilu ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe m'nọ.

8. Ndi-okenye obodo-ya gākpọ kwa ya, gwa ya okwu: ma asi na o guzo, si, Ọ tọghm iluru ya na nwunye;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 25