1. Mb͕e ise-okwu di n'etiti ndikom, ha we biaru nso ka ewe kpe ikpe, ndi-ikpé we kpe ha; ha gāgu kwa onye ezi omume n'onye ezi omume, gu kwa onye nēmebi iwu n'onye nēmebi iwu;
2. ọ gēru kwa, ọ buru na onye nēmebi iwu kwesiri ka etie ya ihe, na onye-ikpé gēme ka o dina ala, ka eti kwa ya ihe n'iru ya, dika nke gēzù nmebi-iwu-ya, n'ọnu-ọgugu.
3. Ọgu otiti abua ka o gēti ya, ọ gaghi-eti kari: ka ọ ghara ibu, ma asi na o gēti ya ọtutu otiti ka ndia, na agēlelì kwa nwa-nne-gi n'anya-gi.
4. Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka.
5. Mb͕e umu-nne ndikom gēbikọ, otù nime ha ewe nwua, ma ọ nweghi nwa-nwoke, nwunye onye ahu nke nwuru anwu agaghi-aburu nwoke ala ọzọ nwunye n'èzí: nwa-nne di-ya gābakuru ya, luru ya n'onwe-ya na nwunye, we lua ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe ọ nọ.
6. Ọ gēru kwa, na ọkpara ọ gāmu gānọchi n'aha nke nwa-nne-ya nke nwuru anwu, ka aghara ihichapu aha-ya n'Israel.