Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 24:13-22 Bible Nso (IGBOB)

13. i ghaghi inyeghachi ya ihe-ibe ahu mb͕e anyanwu nāda, ka o we dina ala n'uwe-ya, we gọzie gi: o we buru gi ezi omume n'iru Jehova, bú Chineke-gi.

14. Emeb͕ula onye egoro ọlu nke bu onye ewedera n'ala na ob͕eye, ma o sitere n'umu-nne-gi, ma-ọbu na o sitere na ndi-ọbìa-gi ndi nọ n'ala-gi nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula.

15. N'ubọchi-ya ka i gēnye ya ugwọ-ọlu-ya, anyanwu agaghi-adakpu kwa ya; n'ihi na onye ewedara n'ala ka ọ bu, nke ahu ka ya onwe-ya nātukwasi kwa nkpuru-obi-ya: ka o we ghara ikpọku Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.

16. Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha: agēme ka ha nwua, onye ọ bula nime nmehie nke aka ya.

17. Ewezugala ikpé ọbìa, bú nwa-nb͕ei; ewere-kwa-la uwe nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe:

18. ma i gēcheta na orù ka i buri n'Ijipt, Jehova, bú Chineke-gi, we b͕aputa gi n'ebe ahu: n'ihi nka ka m'nēnye gi iwu ime ihe a.

19. Mb͕e i nēwe ihe-ubi n'ubi-gi, i we chezọ ùkwù ọka n'ubi, ejeghachila iweta ya: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume aka-gi nile.

20. Mb͕e i nētisisi nkpuru osisi olive gi, eletala alaka-ya ọzọ n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.

21. Mb͕e i nāghọrọ nkpuru ubi-vine-gi, atutukọla nkpuru-ya fọduru n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.

22. I gēcheta kwa na orù ka i buri n'ala Ijipt: n'ihi nka ka m'nēnye gi iwu ime ihe a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 24