Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 23:12-24 Bible Nso (IGBOB)

12. I gēnwe kwa otù ebe n'azu ọmuma-ulo-ikwū ebe i ganāpu je n'ọgwe:

13. i gēnwe kwa osekè n'etiti ihe-agha-gi; ọ gēru kwa, mb͕e i nānọdu n'ọgwe, na i gēwere ya gwue ala, i we chigharia kpochie ihe si n'aru-gi puta:

14. n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nējeghari n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi, inaputa gi, na irara ndi-iro-gi nye n'iru gi; ọmuma-ulo-ikwū-gi gādi kwa nsọ: ka O we ghara ihu n'etiti gi ọtọ ihe ọ bula, we laghachi n'iso gi n'azu.

15. Emechibidola orù nye onye-nwe-ya, bú onye naputaworo onwe-ya n'aka onye-nwe-ya b͕akute gi:

16. ọ gēbiyere gi, n'etiti gi, n'ebe ahu nke ọ gārọputa n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, n'ebe di ya nma: emela ya ihe-ike.

17. Nwayi edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi n'etiti umu-ndinyom Israel, nwoke edoro nsọ ikwa iko agaghi-adi kwa n'etiti umu-ndikom Israel.

18. Ewebatala onyinye enyere nwayi nākwa iko, ma-ọbu ihe eretara na nkita, n'ulo Jehova, bú Chineke-gi, imezù nkwa ọ bula: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ha abua bu kwa.

19. Ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma; bú uma nke ego, ma-ọbu uma nke ihe-oriri, ma-ọbu uma nke ihe ọ bula nke anēbinye n'uma:

20. onye ala ọzọ ka i gēbinye ihe n'uma; ma ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi na nseti aka-gi nile, n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.

21. Mb͕e i gēkwe Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, alala azu n'ikwughachi ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n'aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi.

22. Ma mb͕e i ghara ikwe nkwa, ọ gaghi-abu nmehie nime gi.

23. Ihe nke nēsi n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi puta ka i gēdebe, me kwa; dika i kweworo Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, ọ bu onyinye-afọ-ofufo, nke i kwuworo n'ọnu-gi.

24. Mb͕e ọ bula i nābà n'ubi-vine nke ab͕ata-obi-gi, i gēri kwa nkpuru-vine, dika nkpuru-obi-gi si achọ, nke gēju gi afọ; ma etiyela nkpuru ọ bula n'ihe-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 23