isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 22 Bible Nso (IGBOB)

1. I gaghi-ahu ehi nwa-nne-gi, ma-ọbu aturu-ya, nke nāchọ ifu efu, we zopu onwe-gi n'ebe ha di: i ghaghi iwere ha nyeghachi nwa-nne-gi.

2. Ma ọ buru na nwa-nne-gi anọghi gi nso, ọ buru kwa na i maghi ya, i gēwebata kwa ya n'etiti ulo-gi, ọ gādi kwa n'aka-gi rue mb͕e nwa-nne-gi gāju ase ya, i we were ya nyeghachi ya.

3. Otú a ka i gēme-kwa-ra inyinya-ibu-ya; otú a ka i gēme-kwa-ra uwe-nb͕okwasi-ya; otú a ka i gēme-kwa-ra ihe ọ bula furu efu nke nwa-nne-gi, nke nēfunari ya, ma i hutawo ya: i pughi izo onwe-gi.

4. I gaghi-ahu inyinya-ibu nwa-nne-gi ma-ọbu ehi-ya ka ha nāda n'uzọ, we zopu onwe-gi n'ebe ha di: i ghaghi isoro ya ibuli ha elu.

5. Ihe diri nwoke agaghi-adikwasi n'aru nwayi, nwoke agaghi-eyiri kwa uwe-nb͕okwasi nwayi: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka onye ọ bula bu nke nēme ihe ndia.

6. Mb͕e akwu nnunu di n'iru gi n'uzọ, n'osisi ọ bula, ma-ọbu n'ala, umu-nnunu ma-ọbu àkwá adi kwa nime ya, nne ekpukwasi kwa umu-ya ma-ọbu àkwá-ya, ewela nne na umu-ya:

7. i ghaghi íme ka nne-nnunu la, ma umu-ya ka i gēwere n'onwe-gi; ka o we diri gi nma, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya.

8. Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n'ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da.

9. Aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-vine-gi: ka ojuju nke nkpuru i nāgha na ihe-ọmume ubi-vine-gi we ghara idi nsọ.

10. Ejikọla ehi na inyinya-ibu idọ ihe eji gwu ala-ubi.

11. Eyila uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta, bú aji-anu na flax n'otù.

12. I gēmere onwe-gi ihe-ogho akpara akpà n'elu usọ anọ nke ihe-nb͕okwasi-gi, bú nke i ji b͕okwasi onwe-gi.

13. Mb͕e nwoke gāluru nwunye, bakuru ya, kpọ ya asì,

14. we bo ya ebubo ihere, we weta aha ọjọ n'isi ya, si, Nwayi a ka m'luru na nwunye, m'we biarue ya nso, ma achọtaghm n'aru ya ihe nēgosi na ọ bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke:

15. nna nwa-ab͕ọghọ ahu, na nne-ya, gēwere kwa ihe nēgosi na nwa-ab͕ọghọ ahu bu onye nāmaghi nwoke, ha gēweputa-kwa-ra ha ndi-okenye obodo, rue ọnu-uzọ-ama:

16. nna nwa-ab͕ọghọ ahu gāsi kwa ndi-okenye ahu, Nwam nwayi ka m'nyere nwoke a na nwunye, o we kpọ ya asì;

17. ma, le, nwoke a ebowo ya ebubo ihere, si, Achọtaghm n'aru nwa-gi nwayi ihe nēgosi na ọ bu nwayi nāmaghi nwoke; ma ndia bu ihe nēgosi na nwam nwayi bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ha gāb͕asa kwa uwe-nb͕okwasi-ya n'iru ndi-okenye obodo ahu.

18. Ndi-okenye obodo ahu gēwere nwoke ahu dọ ya aka na nti;

19. ha gēri kwa ya nra ọgu shekel ọla-ọcha ise, nye nna nke nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o wetawo aha ọjọ n'isi nwa-ab͕ọghọ nke Israel nāmaghi nwoke: ya ka ọ gābu-kwa-ra nwunye; ọ pughi ichupu ya ubọchi-ya nile.

20. Ma ọ buru na ihe a bu, ezi-okwu, na achọtaghi n'aru nwa-ab͕ọghọ ahu ihe nēgosi na ọ bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke:

21. ha gēme kwa ka nwa-ab͕ọghọ ahu putarue ọnu-uzọ ulo nna-ya, ndikom obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya ka ọ we nwua: n'ihi na o mere ihe-nzuzu n'Israel, ikwa iko n'ulo nna-ya: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.

22. Mb͕e agāhuta nwoke ka ya na nwayi nēdina, bú nwayi nke di lutaworo, ha abua gānwu kwa, bú nwoke ahu nke ya na nwayi ahu nēdina, na nwayi ahu: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'Israel.

23. Mb͕e nwa-ab͕ọghọ di nke bu nwayi nāmaghi nwoke, nke nwoke kwere ilu, ma nwoke hutara ya n'obodo, we soro ya dina;

24. unu gēme kwa ka ha abua putarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, unu gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha we nwua; nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o tighi nkpu n'obodo: na nwoke ahu, n'ihi na o wedawo nwunye madu-ibe-ya n'ala: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.

25. Ma ọ buru na nwoke ahu ahuta nwa-ab͕ọghọ ahu n'ọhia, bú nwayi nwoke kwere ilu, nwoke ahu ewe jigide ya n'ike, soro ya dina; ọ bu kwa nání nwoke nke soro ya dina gānwu:

26. ma ọ dighi ihe i gēmere nwa-ab͕ọghọ ahu; ọ dighi nmehie ọnwu diri nwa-ab͕ọghọ ahu: n'ihi na dika mb͕e nwoke nēbili imegide madu-ibe-ya, we b͕ue ya eb͕u, otú a ka okwu a di:

27. n'ihi na n'ọhia ka ọ hutara ya; nwa-ab͕ọghọ ahu nwoke kwere ilu tiri nkpu, ma ọ dighi onye-nzọputa o nwere.

28. Mb͕e nwoke gāhuta nwa-ab͕ọghọ nke bu nwayi nāmaghi nwoke, nke nwoke nēkweghi ilu, o we jide ya, soro ya dina, ewe huta ha;

29. nwoke ahu nke soro ya dina gēnye kwa nna nwa-ab͕ọghọ ahu ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri, ya ka nwa-ab͕ọghọ ahu gābu-kwa-ra nwunye, n'ihi na o wedawo ya n'ala; ọ pughi ichupu ya ubọchi-ya nile.

30. Nwoke agaghi-ekuru nwunye nna-ya, ọ gaghi-ekpughe kwa uwe kpuchiri ọtọ nna-ya.