Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 19:8-21 Bible Nso (IGBOB)

8. Ọ buru kwa na Jehova, bú Chineke-gi, eme ókè-ala-gi ka ọ sa mbara, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, O we nye gi ala ahu nile nke O kwuru, si na Ọ gēnye nna-gi-hà;

9. mb͕e i gēdebe ihe nile a enyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ime ya, ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ije ije n'uzọ-Ya nile ubọchi-gi nile; i gātukwasi-kwa-ra onwe-gi obodo atọ ọzọ n'obodo atọ ndia:

10. ka ewe ghara iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa, ọbara we dikwasi gi n'isi.

11. Ma mb͕e nwoke ọ bula bu onye nākpọ madu-ibe-ya asì, o we che ya anwu, bilie megide ya, tipu ndu-ya, o we nwua; ob͕u-madu ahu we b͕alaga n'otù nime obodo ndia:

12. ndi-okenye obodo-ya gēzì kwa kpọputa ya n'ebe ahu, were ya nye n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, ka o we nwua.

13. Anya-gi agaghi-emere ya ebere, ma i gēkpochapu n'Israel ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ, ka o we diri gi nma.

14. Ewezugala ókè-ala ab͕ata-obi-gi, nke ndi mbu akpawo, n'ihe-nketa-gi nke i gēketa, n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i nweta ya.

15. Nání otù onye-àmà agaghi-ebili imegide onye ọ bula bayere ajọ omume ọ bula, ma-ọbu bayere nmehie ọ bula, nime nmehie ọ bula nke ọ nēmehie: n'ọnu ndi-àmà abua, ma-ọbu n'ọnu ndi-àmà atọ, ka okwu gēguzosi ike.

16. Mb͕e onye-àmà nke ihe-ike gēbili megide onye ọ bula ib͕agide ya àmà bayere nwezuga;

17. ndikom abua ahu, ndi ise-okwu ahu diri, gēguzo n'iru Jehova, n'iru ndi-nchu-àjà na ndi-ikpé ndi gānọ na mb͕e ahu;

18. ndi-ikpé gaju kwa ase nke-ọma: ma, le, asi na onye-àmà ahu bu onye-àmà ugha, nke b͕agideworo nwa-nne-ya àmà ugha;

19. unu gēme kwa ya, dika o zubere ime nwa-nne-ya; i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.

20. Ndi fọduru gānu kwa, tu kwa egwu, ha agaghi-eme kwa dika ihe ọjọ a si di ọzọ n'etiti gi.

21. Anya-gi agaghi-eme ebere; ndu lara ndu, anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 19