Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 19:14-21 Bible Nso (IGBOB)

14. Ewezugala ókè-ala ab͕ata-obi-gi, nke ndi mbu akpawo, n'ihe-nketa-gi nke i gēketa, n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i nweta ya.

15. Nání otù onye-àmà agaghi-ebili imegide onye ọ bula bayere ajọ omume ọ bula, ma-ọbu bayere nmehie ọ bula, nime nmehie ọ bula nke ọ nēmehie: n'ọnu ndi-àmà abua, ma-ọbu n'ọnu ndi-àmà atọ, ka okwu gēguzosi ike.

16. Mb͕e onye-àmà nke ihe-ike gēbili megide onye ọ bula ib͕agide ya àmà bayere nwezuga;

17. ndikom abua ahu, ndi ise-okwu ahu diri, gēguzo n'iru Jehova, n'iru ndi-nchu-àjà na ndi-ikpé ndi gānọ na mb͕e ahu;

18. ndi-ikpé gaju kwa ase nke-ọma: ma, le, asi na onye-àmà ahu bu onye-àmà ugha, nke b͕agideworo nwa-nne-ya àmà ugha;

19. unu gēme kwa ya, dika o zubere ime nwa-nne-ya; i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.

20. Ndi fọduru gānu kwa, tu kwa egwu, ha agaghi-eme kwa dika ihe ọjọ a si di ọzọ n'etiti gi.

21. Anya-gi agaghi-eme ebere; ndu lara ndu, anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 19