Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 19:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēbipu mba ahu, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ala-ha, i we napu ha ala-ha, we biri n'obodo nile ha, na n'ulo nile ha;

2. i gākpaputara onwe-gi obodo atọ n'etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ka i we nweta ya.

3. I gēdoziri onwe-gi uzọ, kè kwa ókè-ala nke ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēme gi ka i keta, uzọ atọ, ka ob͕u-madu ọ bula we b͕alaga n'ebe ahu.

4. Nka bu kwa okwu bayere ob͕u-madu, nke gāb͕alaga n'ebe ahu, we di ndu: onye nēb͕u madu-ibe-ya n'amaghi-ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga;

5. dika mb͕e ya na ibe-ya nābà n'oké ọhia ikpọwa nkú, aka-ya we fé anyu-ike ib͕utu osisi, anyu-ike, bú ígwè, we b͕upu n'osisi ahu, we rue madu-ibe-ya aru, o we nwua; onye ahu gāb͕alaga n'otù nime obodo ndia, we di ndu:

6. ka onye-ọ́bọ̀ ọbara we ghara ichu ob͕u-madu ahu n'azu, mb͕e obi-ya di ọku, o we rue ya aru, n'ihi na uzọ di anya, ọ we tipu ndu-ya; ma ikpe ọnwu amaghi ya, n'ihi na ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.

7. N'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I gākpaputara onwe-gi obodo atọ.

8. Ọ buru kwa na Jehova, bú Chineke-gi, eme ókè-ala-gi ka ọ sa mbara, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, O we nye gi ala ahu nile nke O kwuru, si na Ọ gēnye nna-gi-hà;

9. mb͕e i gēdebe ihe nile a enyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ime ya, ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ije ije n'uzọ-Ya nile ubọchi-gi nile; i gātukwasi-kwa-ra onwe-gi obodo atọ ọzọ n'obodo atọ ndia:

10. ka ewe ghara iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa, ọbara we dikwasi gi n'isi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 19