isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 18 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bú ebo Livai nile, ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa ha gēsoro Israel nwe: àjà-ọku nile nke Jehova na ihe-nketa-Ya ka ha gēri.

2. Ọ dighi kwa ihe-nketa ha gēnwe n'etiti umu-nne-ha: Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwaworo ha.

3. Nka bu kwa ihe ekpeziri ka enye ndi-nchu-àjà site n'aka ndi Israel, bú site n'aka ndi nāchu àjà, ma ọ bu ehi-ma-ọbu aturu, na ha gēnye onye-nchu-àjà ọkwa-aka-ya, na ǹtì-ya abua, na okwurù-ya.

4. Ihe mbu nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na ihe mbu nke aji ìgwè ewu na aturu-gi, ka i gēnye ya.

5. N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, arọputawo ya n'ebo-gi nile, iguzo ije ozi n'aha Jehova, ya onwe-ya na umu-ya ndikom ubọchi-gi nile.

6. Mb͕e onye Livai gābia site n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile site n'Israel nile, ebe ya onwe-ya nọ dika ọbìa, ọ we were agu nile nāgu nkpuru-obi-ya biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa;

7. ọ gēje kwa ozi n'aha Jehova, bú Chineke-ya, dika umu-nne-ya nile, bú ndi Livai, ndi nēguzo n'ebe ahu n'iru Jehova.

8. Òkè dika òkè-ya ka ha gēri, nāgughi ihe-ya nile erere nke o nwetara n'aka nna-ya-hà.

9. Mb͕e gi onwe-gi nābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, amutala ime dika ihe-árú nile nke mba ahu nile si di.

10. Agaghi-ahuta n'etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi,

11. ma-ọbu dibia nrafu, ma-ọbu onye nāju mọ ihe, ma-ọbu dibia-afa, ma-ọbu onye nāju ndi nwuru anwu ihe.

12. N'ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n'ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi.

13. Onye zuru okè ka i gābu n'ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ.

14. N'ihi na mba ndia, nke gi onwe-gi gēnweta, nēge nti ndi nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, na ndi nāju ase: ma gi onwe-gi, ọ bughi otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

15. Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka onye-amuma, nke di ka mu onwem, biliere gi site n'etiti gi, site n'umu-nne-gi; onye ahu ka unu gēge nti;

16. dika ihe nile si di nke i riọrọ n'aka Jehova, bú Chineke-gi, na Horeb n'ubọchi nkpọkọta ahu, si, Ka m'ghara inu kwa olu Jehova, bú Chinekem, ọzọ, ka m'ghara kwa ihu ọku uku a ọzọ, ka m'we ghara inwu.

17. Jehova we sim, Ha ekwuwo nke-ọma okwu nke ha kwuworo.

18. M'gēme ka onye-amuma, nke di ka gi, biliere ha site n'etiti umu-nne-ha; M'gētiye kwa okwum nile n'ọnu-ya, ọ gāgwa kwa ha okwu nile nke M'gēnye ya n'iwu.

19. O gēru kwa, na nwoke ọ bula nke nāgaghi-ege nti okwum nile nke ọ gēkwu n'aham, Mu onwem gājuta ya n'aka ya.

20. Ma onye-amuma nke gēwere nganga kwu okwu n'aham, nke M'nēnyeghi ya iwu ikwu, ma-ọbu nke gēkwu n'aha chi di iche iche ọzọ, onye-amuma ahu gānwu kwa.

21. Mb͕e i gāsi n'obi-gi, Àyi gēsi aṅa mara okwu ahu nke Jehova nēkwughi?

22. Okwu nke onye-amuma nēkwu n'aha Jehova, ma okwu ahu emeghi, o reghi kwa; nke ahu bu okwu nke Jehova nēkwugh: na nganga ka onye-amuma ahu kwuworo ya, atula ujọ ya.