Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 17:9-15 Bible Nso (IGBOB)

9. i gābiakute kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, biakute kwa onye-ikpe nke gānọ na mb͕e ahu: i gāju kwa ase; ha gēgosi kwa gi uzọ ikpe ikpe ahu:

10. i gēme kwa dika okwu ahu si di, nke ha gēgosi gi site n'ebe ahu nke Jehova gārọputa; i gēlezi kwa anya ime dika ihe nile si di nke ha gēzí gi:

11. dika iwu ahu si di nke ha gēzí gi, na dika ikpé ahu si di nke ha gāgwa gi, otú a ka i gēme; ewezugala onwe-gi pua n'okwu ahu ha gēgosi gi, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.

12. Ma nwoke ahu nke nēme nganga, n'egeghi nti onye-nchu-àjà ahu nke nēguzo ije ozi n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ma-ọbu n'egeghi nti onye-ikpe ahu, nwoke ahu gānwu kwa: i gēkpochapu kwa ihe ọjọ ahu n'Israel.

13. Ndi Israel nile gānu kwa, tu kwa egwu, we ghara ime nganga ọzọ.

14. Mb͕e i gābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, i we nweta ya, biri nime ya, si, M'gēdo eze ka ọ buru ezem, dika mba nile si eme ndi dim buruburu;

15. i ghaghi ido onye ahu, onye Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, ka ọ buru eze-gi: otù onye n'etiti umu-nne-gi ka i gēdo eze-gi: i pughi ido nwoke ala ọzọ eze-gi, nke nābughi nwa-nne-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 17