Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 17:3-12 Bible Nso (IGBOB)

3. nke jewo-kwa-ra fè chi ọ bula ọzọ òfùfè, we kpọ isi ala nye ha, ma-ọbu inye anyanwu, ma-ọbu inye ọnwa, ma-ọbu inye ihe ọ bula nime usu ihe elu-igwe, nke m'nēnyeghi n'iwu;

4. ewe gosi gi ya, i we nu ya, i gāju kwa ase nke-ọma, ma, le asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n'Israel;

5. i gēme kwa ka nwoke ahu ma-ọbu nwayi ahu puta, bú ndi meworo ihe ọjọ a, rue ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, ọbuná nwoke ahu ma-ọbu nwayi ahu; i gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha nwua.

6. N'ọnu ndi-àmà abua, ma-ọbu ndi-àmà atọ, ka agēme ka ọ nwua, bú onye gānwu anwu; agaghi-eme ka ọ nwua n'ọnu otù onye-àmà.

7. Aka ndi-àmà gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua, ma aka ndi Israel nile gādikwasi ya n'ikpe-azu. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.

8. Mb͕e okwu ọ bula gākari gi n'ikpé, n'etiti ọbara na ọbara, ma-ọbu n'etiti okwu-ikpé na okwu-ikpé, ma-ọbu n'etiti otiti-ihe na otiti-ihe, bú okwu nile nke ise-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile: i gēbili kwa, rigorue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa;

9. i gābiakute kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, biakute kwa onye-ikpe nke gānọ na mb͕e ahu: i gāju kwa ase; ha gēgosi kwa gi uzọ ikpe ikpe ahu:

10. i gēme kwa dika okwu ahu si di, nke ha gēgosi gi site n'ebe ahu nke Jehova gārọputa; i gēlezi kwa anya ime dika ihe nile si di nke ha gēzí gi:

11. dika iwu ahu si di nke ha gēzí gi, na dika ikpé ahu si di nke ha gāgwa gi, otú a ka i gēme; ewezugala onwe-gi pua n'okwu ahu ha gēgosi gi, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.

12. Ma nwoke ahu nke nēme nganga, n'egeghi nti onye-nchu-àjà ahu nke nēguzo ije ozi n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ma-ọbu n'egeghi nti onye-ikpe ahu, nwoke ahu gānwu kwa: i gēkpochapu kwa ihe ọjọ ahu n'Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 17