Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 17:15-19 Bible Nso (IGBOB)

15. i ghaghi ido onye ahu, onye Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, ka ọ buru eze-gi: otù onye n'etiti umu-nne-gi ka i gēdo eze-gi: i pughi ido nwoke ala ọzọ eze-gi, nke nābughi nwa-nne-gi.

16. Nání na ọ gaghi-eme ka inyinya bara ya uba, ọ gaghi-eme kwa ndi Israel ka ha laghachi n'Ijipt, ka o we me ka inyinya ba uba: n'ihi na Jehova asiwo unu, Unu alaghachi-kwa-la n'uzọ ahu ọzọ.

17. Ọ gaghi-eme kwa ka ndinyom bara ya uba, ka obi-ya we ghara iwezuga onwe-ya: ọ gaghi-eme kwa ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba nke-uku.

18. Ọ gēru kwa, mb͕e ọ nānọkwasi n'oche-eze nke ala-eze-ya, na ọ gēdeputara onwe-ya iwu a n'akwukwọ, site n'akwokwọ ahu nke di n'iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai:

19. ọ gādi kwa n'aka-ya, ọ gāgu kwa ihe di nime ya ubọchi nile nke ndu-ya: ka o we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-ya, idebe okwu nile nke iwu a na ukpuru ndia, ime ha:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 17