Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 15:6-17 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi, dika Ọ gwara gi okwu: i gānara kwa ọtutu mba ihe-ibe, ma gi onwe-gi agaghi-ab͕a ihe n'ibe; i gāchi kwa ọtutu mba, ma ha agaghi-achi gi.

7. Mb͕e ob͕eye di n'etiti gi, bú otù onye n'etiti umu-nne-gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ab͕ala obi-gi ume, akwukwubala aka-gi n'ebe nwa-nne-gi, bú ob͕eye, nọ:

8. kama i ghaghi isaghere ya aka-gi, i ghaghi kwa inye ya ihe gēzuru ukọ-ya nke kọrọ ya n'ọnọdu ihe-ibe-ya.

9. Lezie onwe-gi anya ka okwu nke jọb͕uru onwe-ya ghara idi n'obi-gi, si, Arọ nke-asa, bú arọ nrapu, di nso; anya-gi we jọ njọ n'aru nwa-nne-gi, bú ob͕eye, i we ghara inye ya ihe; o we kpọkue Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.

10. I ghaghi inye ya, ọ gaghi-ajọ-kwa-ra obi-gi njọ mb͕e i nēnye ya: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe a ka Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'omume-gi nile, na nime nseti aka-gi nile.

11. N'ihi na ndi-ob͕eye agaghi-agwupu n'etiti ala: n'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I ghaghi isaghere nwa-nne-gi aka-gi, saghere onye nke gi ewedara n'ala, saghe-kwa-ra ob͕eye nke gi, n'ala-gi.

12. Mb͕e agērenye gi nwa-nne-gi, bú nwoke Hibru, ma-ọbu nwayi Hibru, o we fè gi òfùfè arọ isi; n'arọ nke-asa i gēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya.

13. Ma mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya, ezipula ya n'aka efu:

14. i gēsi n'ìgwè ewu na aturu-gi, si kwa n'ebe-nzọcha-ọka-gi, si kwa n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi, nyebiga ya okè; ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, ji gọzie gi ka i gēnye ya.

15. I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n'ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, b͕aputara gi: n'ihi ya ka mu onwem nēnye gi ihe a n'iwu ta.

16. Ọ gēru kwa, mb͕e ọ gāsi gi, M'gaghi-apu n'ebe i nọ; n'ihi na ọ nāhu gi na ulo-gi n'anya, n'ihi na ọ diri ya nma n'ebe i nọ;

17. i gēwere kwa arà, rapue nti-ya na ọnu-uzọ, ọ gābu-kwa-ra gi orù mb͕e ebighi-ebi. Ọ bu kwa otú a ka i gēmere orù-gi nwayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 15