Nka bu kwa okwu nrapu ahu: onye-nbinye ọ bula gārapu ihe nke o nēbinye ab͕ata-obi-ya; ọ gaghi-eji ab͕ata-obi-ya na nwa-nne-ya n'ihe-ike; n'ihi na akpọsara nrapu nye Jehova.