Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 15:18-23 Bible Nso (IGBOB)

18. Ọ gaghi-adi ike n'anya-gi, mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya; n'ihi na okpukpu ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu ka o fèworo gi òfùfè arọ isi: Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi kwa gi n'ihe nile nke i nēme.

19. Nwa ọ bula, bú oké, nke eburu uzọ mu, nke agāmu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, i gēdoro ya Jehova, bú Chineke-gi, nsọ: ejila nwa nke ehi-gi buru uzọ mu lu ọlu-ubi, akpacha-kwa-la aji nke nwa eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu-gi.

20. N'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ya kwa-arọ n'ebe ahu nke Jehova gārọputa, gi onwe-gi na ulo-gi.

21. Ma mb͕e ọlu di n'aru-ya, dika ngwurọ ma-ọbu ìsì, ọlu ọ bula nke jọrọ njọ, achurula ya Jehova, bú Chineke-gi.

22. Nime ọnu-uzọ-ama-gi nile ka i gēri ya: onye ruru árú na onye di ọcha n'otù uzọ ahu, dika mb͕ada, na dika ele.

23. Nání na i gaghi-eri ọbara-ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 15