Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 12:17-32 Bible Nso (IGBOB)

17. I pughi iri n'ọnu-uzọ-ama-gi nile otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, ma-ọbu umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi, ma-ọbu ihe ọ bula nke nkwa-gi nile nke i nēkwe, ma-ọbu onyinye-afọ-ofufo-gi nile, ma-ọbu àjà-nbuli nke aka-gi:

18. kama ọ bu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ha, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, na nseti aka-gi ọ bula.

19. Lezie onwe-gi anya ka i ghara irapu onye Livai ubọchi-gi nile n'elu ala-gi.

20. Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ókè-ala-gi sa mbara, dika Ọ gwara gi, i we si, Ka m'rie anu, n'ihi na agu nāgu nkpuru-obi-gi iri anu; n'agu nile nke nkpuru-obi-gi i gēri anu.

21. Mb͕e ọ gādikari gi anya, bú ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n'ebe ahu, i gēb͕u kwa ufọdu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, nke Jehova nyeworo gi, dika m'nyeworo gi iwu, i gēri kwa n'ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, n'agu nile nke nkpuru-obi-gi.

22. Nání, dika anēri mb͕ada na ele, otú a ka i gēri ha: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ha n'otù uzọ ahu.

23. Nání, di ike ka i ghara iri ọbara: n'ihi na ọbara bu ndu; eri-kwa-la ndu tiyere anu.

24. Erila ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.

25. Erila ya; ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.

26. Nání ihe nsọ gi nile nke i nwere, na ihe-nkwa-gi nile, ka i gēbuli, biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa:

27. i gāchu kwa aja-nsure-ọku-gi nile, anu na ọbara, n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: agāwukwasi kwa ọbara nke àjà-gi nile n'ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, ma i gēri anu-ha.

28. Riba okwu ndia nile ama, nu kwa ha, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu, ka ọ we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi rue mb͕e ebighi-ebi, mb͕e i nēme ihe di nma nke ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.

29. Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēbipu mba nile n'iru gi, ebe i nābà nime inweta ha, i we nweta ha, biri n'ala-ha;

30. gi lezie onwe-gi anya ka aghara ima gi n'ọnyà iso ha n'azu, mb͕e ekpochapusiri ha n'iru gi; ka i ghara kwa iju ajuju bayere chi nile ha, si, Mba ndia si aṅa nēfè chi nile ha òfùfè? m'gēme kwa otú a, ọbuná mu onwem.

31. Emerela Jehova, bú Chineke-gi, otú a: n'ihi na ihe-árú nile nke Jehova, nke Ọ nākpọ asì, ka ha meworo chi-ha; n'ihi na ọbuná umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha nēsurere chi-ha n'ọku.

32. Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 12