Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 12:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndia bu ukpuru ahu na ikpé ahu, nke unu gēlezi anya ime n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, nyeworo gi ka i nweta ya, ubọchi nile nke unu onwe-unu nādi ndu n'elu ala ahu.

2. Unu aghaghi ime ka ebe ahu nile la n'iyì, bú ebe mba nile unu nēnweta fère chi nile ha òfùfè, n'elu ugwu nile ha di elu, na n'elu ugwu ntà nile ha, na n'okpuru osisi ndu ọ bula:

3. unu gākwatu kwa ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, sure Asherim-ha n'ọku, b͕utu arusi nile apiri api nke chi nile ha, we me ka aha-ha lapu n'iyì n'ebe ahu.

4. Unu emerela Jehova, bú Chineke-unu, otú a.

5. Kama rue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa n'ebo-unu nile, itiye aha-Ya n'ebe ahu, rue ebe-obibi-Ya ka unu gāchọ, i gābà kwa n'ebe ahu:

6. ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēweta àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-unu na ìgwè ewu na aturu-unu:

7. unu gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu gāṅuri kwa ọṅu n'ihe nile unu nēseti aka-unu ime, unu onwe-unu na ulo-unu, nke Jehova, bú Chineke-gi, gọziworo gi nime ha.

8. Unu emela dika ihe nile si di nke ayi onwe-ayi nēme n'ebe a ta, nwoke ọ bula ọ nēme ihe ziri ezi n'anya-ya:

9. n'ihi na unu akābaghi rue ub͕u a n'izu-ike ahu, na n'ihe-nketa ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

10. Ma mb͕e unu gabigara Jọdan, biri n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu keta, mb͕e O mesi-kwa-ra ka unu zuru ike pua n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 12