Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 10:15-22 Bible Nso (IGBOB)

15. Nání na ihe nna-unu-hà di Jehova ezi utọ ka O we hu ha n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, bú unu onwe-unu, n'etiti ndi nile, otú ọ di ta.

16. Bì-kwa-nu obi-unu úgwù, unu abu-kwa-la ndi kwesiri olu ike ọzọ.

17. N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke kachasi chi nile, na Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, Chineke uku ahu, bú dike, di kwa egwu, Onye nāhughi madu iru-ọma n'ikpé, Onye nānaraghi ihe-iri-ngo.

18. Ọ nēme ihe ekpere n'ikpe bayere nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru, Ọ nāhu kwa ọbìa n'anya, inye ya nri na uwe-nb͕okwasi.

19. Hu-kwa-nu ọbìa n'anya: n'ihi na ọ bu ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.

20. Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; Ya ka i gēfè, Ya ka i gārapara n'aru, aha-Ya ka i gēji ṅu iyi.

21. Ya Onwe-ya bu otuto-gi, Ya Onwe-ya bu kwa Chineke-gi, Onye meworo gi ihe uku ndia di egwu, nke anya-gi huworo.

22. Ọ bu ọgu madu atọ na iri ka nna-gi-hà ji rida n'Ijipt; ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-gi, emewo gi ka i di ka kpakpando elu-igwe n'uba.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 10