Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 1:9-17 Bible Nso (IGBOB)

9. M'we gwa unu okwu na mb͕e ahu, si, Apughm ibū unu náním:

10. Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka unu ba uba, ma, le, unu di ka kpakpando elu-igwe n'uba, ta.

11. Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, tukwasi unu madu kari ka unu ra nnù uzọ abua na ọgu uzọ iri, gọzi kwa unu, dika Ọ gwara unu!

12. M'gēsi aṅa, náním, bū ike-ọgwugwu-unu, na ibu-unu, na ise-okwu-unu?

13. Doro onwe-unu ndikom mara ihe, ndi nwe-kwa-ra nghọta, ndi ama-kwa-ra aha-ha, dika ebo nile unu si di, m'gēdo kwa ha ndi-isi-unu.

14. Unu we zam, si, Ihe nke i kwuworo di nma ime.

15. M'we chiri ndi-isi ebo nile unu, ndikom mara ihe, ndi ama-kwa-ra aha-ha, m'we do ha ndi-isi-unu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi madu iri madu iri, na ndi-odozi-okwu, dika ebo nile unu si di.

16. M'we nye ndi-ikpe-unu iwu na mb͕e ahu, si, Nānunu ikpé n'etiti umu-nne-unu, nēkpe-kwa-nu ikpe ezi omume n'etiti nwoke na nwa-nne-ya na ọbìa-ya.

17. Unu amatala iru madu n'ikpé; unu gānu ikpé onye ntà na ikpé onye uku n'otù uzọ ahu; unu atula iru madu ujọ; n'ihi na ikpé ahu, ọ bu Chineke nwe ya: ma okwu nke sikari unu ike, unu gēweta ya nsom, m'gānu kwa ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 1