Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 1:22-28 Bible Nso (IGBOB)

22. Unu we biaruem nso, unu nile, si, Ka ayi zìe ndikom n'iru ayi, ka ha we leputara ayi ala ahu, weghachi-kwa-ra ayi okwu bayere uzọ nke ayi gēsi rigo, na obodo nke ayi gābà nime ha.

23. Okwu ahu we di nma n'anyam: m'we si n'etiti unu chiri ndikom iri na abua, otù nwoke diri otù ebo:

24. ha we che iru, rigo n'ugwu ahu, biarue ndagwurugwu Eshkol, we ledo ya.

25. Ha we were ufọdu nime nkpuru ala ahu n'aka-ha, wedatara ayi ya, weghachiri ayi okwu, si, Ọ di nma, bú ala nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.

26. Ma unu achọghi irigo, kama unu nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu:

27. unu we tamu ntamu n'ulo-ikwū-unu, si, N'asì nke Jehova kpọrọ ayi ka O mere ka ayi si n'ala Ijipt puta, inye ayi n'aka ndi-Amorait, ikpochapu ayi.

28. Òle ebe ayi onwe-ayi nārigo? umu-nne-ayi emewo ka obi-ayi ghara idi ike, si, Ọ bu ndi di uku di kwa ogologo kari ayi, na obodo uku ewusiri ike rue elu-igwe; ọzọ kwa, umu Anakim ka ayi huru n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 1