Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 1:21-32 Bible Nso (IGBOB)

21. Le, Jehova, bú Chineke-gi, edowo ala ahu n'iru gi: rigo, nweta, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu; atula egwu, atu-kwa-la ujọ.

22. Unu we biaruem nso, unu nile, si, Ka ayi zìe ndikom n'iru ayi, ka ha we leputara ayi ala ahu, weghachi-kwa-ra ayi okwu bayere uzọ nke ayi gēsi rigo, na obodo nke ayi gābà nime ha.

23. Okwu ahu we di nma n'anyam: m'we si n'etiti unu chiri ndikom iri na abua, otù nwoke diri otù ebo:

24. ha we che iru, rigo n'ugwu ahu, biarue ndagwurugwu Eshkol, we ledo ya.

25. Ha we were ufọdu nime nkpuru ala ahu n'aka-ha, wedatara ayi ya, weghachiri ayi okwu, si, Ọ di nma, bú ala nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.

26. Ma unu achọghi irigo, kama unu nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu:

27. unu we tamu ntamu n'ulo-ikwū-unu, si, N'asì nke Jehova kpọrọ ayi ka O mere ka ayi si n'ala Ijipt puta, inye ayi n'aka ndi-Amorait, ikpochapu ayi.

28. Òle ebe ayi onwe-ayi nārigo? umu-nne-ayi emewo ka obi-ayi ghara idi ike, si, Ọ bu ndi di uku di kwa ogologo kari ayi, na obodo uku ewusiri ike rue elu-igwe; ọzọ kwa, umu Anakim ka ayi huru n'ebe ahu.

29. M'we si unu, Unu amala jijiji, unu atu-kwa-la egwu ha.

30. Jehova, bú Chineke-unu, Onye nēje n'iru unu, Ya onwe-ya gēburu unu agha, dika ihe nile si di nke O mere bayere unu n'Ijipt n'anya-unu;

31. na n'ọzara, ebe i huworo na Jehova, bú Chineke-gi, kuru gi, dika nwoke si eku nwa-ya nwoke, n'uzọ ahu nile nke unu jere, rue mb͕e unu biaruru ebe a.

32. Ma n'okwu nka unu ekweghi na Jehova, bú Chineke-unu,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 1