Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 1:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndia bu okwu ahu nke Moses gwara Israel nile n'ofè Jọdan n'ọzara, n'Araba ahu na ncherita-iru Suf, n'etiti Peran, na Tofel, na Leban, na Hazerot, na Di-zahab.

2. Ọ bu ubọchi iri na otù site na Horeb rue Kedesh-banea ma i si n'uzọ ugwu Sia.

3. O rue, n'arọ nke-ọgu-abua, n'onwa nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na Moses gwara umu Israel okwu, dika ihe nile Jehova nyere ya n'iwu inye ha si di;

4. mb͕e o tib͕usiri Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke bi na Heshbon, na Og, bú eze Beshan, nke bi n'Ashtarot, n'Edrei:

5. n'ofè Jọdan, n'ala Moab, ka Moses jisiri ike ikpọputa isi iwu a, si,

6. Jehova, bú Chineke-ayi, gwara ayi okwu na Horeb, si, O zuworo unu ibi n'ugwu a:

7. chenu iru, bulie ije, ba n'ugwu ndi-Amorait, ru kwa ab͕ata-ya nile, n'Araba, na n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na nime Negeb, na n'ọnu-miri nke oké osimiri, bú ala nke ndi Kenean, na Lebanon, rue Osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 1