Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 6:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ di Daraiọs nma n'anya ido ọgu madu isi, bú ndi nọchiri anya eze, ka ha buru ndi-isi ala-eze-ya, ndi gānọ n'ala-eze ahu nile;

2. na ido ndi-isi atọ ndi-isi-ha, ndi Daniel bu otù nime ha; ka ndi ahu ndi nọchiri anya eze we nākọrọ ha akukọ ihe nile ha nēme, ka o we ghara kwa idi ihe nēfunari eze.

3. Mb͕e ahu Daniel nka ghọrọ ọkaka n'elu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze, n'ihi na mọ nke kachasi di nime ya; eze we zube ido ya onye-isi ala-eze-ya nile.

4. Mb͕e ahu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze nọ nāchọ ichọputa ihe-ebubo iji bo Daniel bayere ala-eze; ma ọ dighi ihe-ebubo maọbu omume bibiri ebibi ọ bula ha puru ichọputa; n'ihi na onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu, ọ dighi kwa nmehie ma-ọbu omume bibiri ebibi ọ bula achọputara n'aru ya.

5. Mb͕e ahu ndikom ndia nāsi, Ayi agaghi-achọputa ihe-ebubo iji bo Daniel nka, ma isi na ayi achọputaghi ya n'aru ya n'iwu nke Chineke-ya.

6. Mb͕e ahu ndi-isi ndia na ndi nọchiri anya eze ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Daraiọs, bú eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 6