Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 5:9-12 Bible Nso (IGBOB)

9. Mb͕e ahu eze, bú Belshaza, mara jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke iru-ya b͕anwe-kwa-ra n'aru ya, ọ nāb͕a kwa ndi-isi-ya ghari.

10. Ma eze-nwanyi were n'ihi okwu nile nke eze na ndi-isi-ya bata n'ulo oké oriri ahu: eze-nwanyi zara, si, Eze, di ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi; ka èchìchè-gi nile ghara ime ka i ma jijiji, ka ib͕u-maramara nke iru-gi ghara kwa ib͕anwe:

11. otù nwoke di n'ala-eze-gi, onye mọ nke chi nsọ nile di nime ya; ọzọ, n'ubọchi nna-gi ìhè na uche na amam-ihe, dika amam-ihe nke chi nile, ka ahuru nime ya: ọzọ, eze ahu, bú Nebukadneza, bú nna-gi, onye-isi nke ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe ka o doro ya, bú nna-gi, eze;

12. n'ihi na mọ nke kachasi, na ihe-ọmuma, na uche, na ikọ isi nrọ di iche iche, na ikọ isi okwu-omimi di iche iche, na itọsi okwu nke nāb͕a ghari, ka ahuru nime ya, bú Daniel, onye eze ahu guru aha-ya Belteshaza. Ub͕u a, ka akpọta Daniel, ọ gākọ kwa isi ihe a edere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 5