Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 5:26-30 Bible Nso (IGBOB)

26. Nka bu akukọ-isi ihe ahu: MENE; Chineke agutawo ala-eze-gi ọnu, me ka mb͕e-ya ruzue.

27. TEKEL; atùwo gi n'ihe-ọtùtù, hu na ihe kọrọ nime gi.

28. PERES; ekewawo ala-eze-gi, nye ndi Midia na ndi Peasia.

29. Mb͕e ahu Belshaza kwuru okwu, ha we yibe Daniel uwe-ododo, yibe kwa ya iyab͕a ọla-edo n'olu-ya, kwusa okwu bayere ya, si na ọ gābu onye nāchi achi dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze ahu.

30. N'abali ahu ka eb͕uru Belshaza, bú eze Kaldea.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 5