Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 4:26-33 Bible Nso (IGBOB)

26. Ma ebe ha siri ka arapu ogwe nkpọrọgwu nke osisi ahu; ala-eze-gi gēguzosiri gi ike, site na mb͕e i gāma na elu-igwe nāchi achi.

27. N'ihi nka, eze, kwe ka ndum-ọdum di gi nma n'anya, were kwa ezi omume tijipu nmehie-gi nile, were kwa imere ndi ewedara n'ala amara tijipu ajọ omume-gi nile; asi na ogologo mb͕e gādiri udo-gi.

28. Ihe a nile rutere Nebukadneza, bú eze, aru.

29. N'ọgwugwu ọnwa iri na abua, n'elu ulo uku ala-eze ahu nke Babilon ka ọ nọ nējeghari.

30. Eze zara, si, Ọ̀ bughi nka bu Babilon uku a, nke mu onwem wuworo ibu ulo ala-eze, site n'ike nke àkùm na n'ihi ebube nke ima-nmam?

31. Mb͕e eze kpu okwu a n'ọnu, otù olu siri n'elu-igwe da, si, Gi ka anāgwa okwu, Nebukadneza, bú eze, si: Ala-eze apuwo n'aka-gi.

32. Aganēsi kwa n'ebe madu bi chupu gi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi; ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, oge asa gāgabiga kwa n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ka Ọ nēnye ya.

33. N'otù oge hour ahu ka okwu a rère n'aru Nebukadneza: ewe si n'ebe madu bi chupu ya, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka ọ nāta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya, rue mb͕e agiri-isi-ya toputara dika ábúbà ugo, mbọ-aka-ya kwa dika mbọ nnunu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 4