Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 3:19-30 Bible Nso (IGBOB)

19. Mb͕e ahu Nebukadneza juputara n'ọnuma, udi iru-ya we b͕anwe imegide Shedrak na Mishak na Abed-nego: ya mere ọ zara, si ka ha me oké ọku ahu ka ọ di ọku ub͕ò asa kari otú anēmeri ka ọ di ọku.

20. Ọ si-kwa-ra ndi-dike ufọdu bu dìnkpà, ndi di n'usu-ndi-agha-ya, ka ha ke Shedrak na Mishak na Abed-nego ab͕u, tubà ha n'oké ọku nēnwu ajọ onwunwu.

21. Mb͕e ahu ekere ndikom ndia ab͕u n'uwe-ukwu-ha, na ákwà-nkechi-isi-ha, na uwe-nwuda-ha, na uwe nile ha, ewe tubà ha n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu.

22. N'ihi nka, n'ihi na okwu eze di ọku ọku, na n'ihi na oké ọku ahu bu ihe emeworo ka ọ dikari ọku ókè, ọbuná ndikom ahu ka ire ọku b͕uru, bú ndi meworo ka Shedrak na Mishak na Abed-nego rigota.

23. Ndikom atọ ndia, bú Shedrak na Mishak na Abed-nego, we da n'ala n'ab͕u n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu.

24. Mb͕e ahu o juru Nebukadneza, bú eze, anya, o we were ọsọ bilie: ọ zara, si ndi-ndum-ọdu-ya, Ọ bughi ndikom atọ ekere ab͕u ayi tubàra n'etiti ọku ahu? Ha zara, si eze, Ọ bu ezie, eze.

25. Ọ zara, si, Le, mu onwem nāhu ndikom anọ atọpuru ab͕u, nējeghari n'etiti ọku ahu, ma emerughi ha ahu; onye ahu nke mere ha anọ yiri nwa nke ndi bu chi n'ile ya anya.

26. Mb͕e ahu Nebukadneza biaruru nso ọnu-uzọ oké ọku ahu nke nēnwu ajọ onwunwu: ọ kwuru, si, Shedrak na Mishak na Abed-nego, unu ndi-orù nke Chineke Nke kachasi ihe nile elu, putanu, bia. Mb͕e ahu Shedrak na Mishak na Abed-nego siri n'etiti ọku ahu puta.

27. Ndi ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi ahu, na ndi ahu nāchi achi, na ndi-ndum-ọdu eze, ebe ha zukọtaworo, ha hu-kwa-ra ndikom ndia, na ọku ahu enweghi ike n'aru-ha, ọku aṅachaghi kwa agiri-isi nke isi-ha, uwe-ukwu-ha ab͕anweghi kwa, ísì ọku agabigaghi kwa n'aru ha.

28. Nebukadneza zara, si, Onye agọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego bu, Onye ziteworo mọ-ozi-Ya, we naputa ndi-orù-Ya ndi tukwasiri Ya obi, ọ bu kwa okwu eze ka ha b͕anweworo, we rara aru-ha nye, ka ha we ghara ifè ma-ọbu ikpọ isi ala nye chi ọ bula, ma-ọbughi Chineke-ha.

29. N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, na ndi ọ bula, ma-ọbu mba ọ bula, ma-ọbu asusu ọ bula, nke gēkwuhie megide Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego, agābọkasi ya, ọ bu kwa ulo-ya ka agēme ebe-ikpofu-ahihia: n'ihi na ọ dighi chi ọzọ nke puru inaputa otú a.

30. Mb͕e ahu eze mere ka ihe gara Shedrak na Mishak na Abednego nke-ọma n'ala ahu anāchi achi, bú Babilon.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 3