Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 12:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma na mb͕e ahu ka Maikael gēguzo ọtọ, bú onye-isi uku ahu nke nēguzo n'akuku umu ndi-gi: mb͕e ahuhu gādi kwa, nke mb͕e di otú ahu nādighi site na mb͕e mba ọ bula malitere idi rue mb͕e ahu: ma na mb͕e ahu ka agēme ka ndi-gi wepuga onwe-ha, bú onye ọ bula agāhu na edeworo aha-ya n'akwukwọ.

2. Ọzọ, ọtutu madu nime ndi nāraru ura n'ala, bú ájá, gēteta, ufọdu ibà na ndu ebighi-ebi, ufọdu ibà n'ita-uta riri nne na oyi agāsọ ha nke-uku mb͕e ebighi-ebi.

3. Ma ndi ahu ndi nwere uche ganēnwu ọcha dika onwunwu-ọcha nke mbara-ígwé; ndi nēme ọra madu ka ha ghọ ndi ezi omume ganāmu kwa dika kpakpando rue mb͕e nile ebighi-ebi.

4. Ma gi onwe-gi, Daniel, zobe okwu ndia, kachita kwa akwukwọ a akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: ọtutu madu ganējeghari, ihe-ọmuma gāba kwa uba.

5. M'we hu, mu onwem, bú Daniel, ma, le, abua ọzọ nēguzo, otù onye n'otù usọ osimiri ahu, ibe-ya n'usọ osimiri nke-ọzọ.

6. Otù nime ha we si onye ahu nke yiri uwe ọcha, nke nọ n'elu miri nke osimiri ahu, Rùe ole mb͕e ka ọgwugwu oké ọlu ndia gādi?

7. M'we nu onye ahu nke yiri uwe ọcha, onye nọ n'elu miri nke osimiri ahu, o we welie aka-nri-ya na aka-ekpe-ya n'elu-igwe, were Onye ahu Nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi, si, na ọ gādiru otù mb͕e akara àkà, na mb͕e abua akara àkà, na nkera mb͕e akara àkà; ma mb͕e agāb͕ajisi aka nke ndi nsọ ahu, ihe nile ndia gāgwusi.

8. Mu onwem we nu, ma adighm-aghọta: m'we si, Onye-nwem, Gini bu mb͕e ikpe-azu nke ihe ndia?

9. O we si, La, Daniel: n'ihi na ezobewo okwu ndia, kachita kwa ha akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia.

10. Ọtutu madu gēme onwe-ha ka ha di ọcha, ha gēme onwe-ha ka ha nwue ọcha, agānucha kwa ha; ma ndi nēmebi iwu gēmebi iwu; ndi nile nke nēmebi iwu agaghi-aghọta kwa ihe: ma ndi ahu ndi nwere uche gāghọta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 12