Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 11:27-33 Bible Nso (IGBOB)

27. Ma eze abua ndia, obi-ha gādi n'ime ihe ọjọ, ọ bu kwa n'otù table ka ha gēkwu okwu-ugha: ma ọ gaghi-aga nke-ọma; n'ihi na ọgwugwu fọduru idi na mb͕e akara àkà.

28. Ọ gālaghachi kwa n'ala-ya n'àkù uku; obi-ya gābu kwa imegide ọb͕ub͕a-ndu nsọ; ọ gēme kwa ihe, laghachi n'ala-ya.

29. Na mb͕e akara àkà ka ọ gābiaghachi, ba na Ndida; ma ọ gaghi-adi na mb͕e ikpe-azu otù ọ diri na mbu.

30. Ma ub͕ọ Kitim gābia imegide ya; obi-ya ewe mebie emebi, o we laghachi, wesa ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu oké iwe, me ihe, laghachi, tugharia uche na ndi nārapu ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu.

31. Ogwe-aka ufọdu gēsite kwa n'akuku-ya guzo, me ka ebe nsọ ahu ghara idi nsọ, bú ebe ahu siri ike, ha gēwezuga kwa àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, ha gēdo kwa ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.

32. Ọ bu kwa ndi nēmebi iwu megide ọb͕ub͕a-ndu ahu ka ọ gēmeru site n'ire-utọ di iche iche: ma ndi ahu nke mara Chineke-ha gādi ike, me ihe.

33. Ọzọ, ndi nwere uche n'etiti ndi Chineke gēme ka ọra madu ghọta ihe: ma ha gāsu ngọngọ site na mma'agha, site kwa n'ire-ọku, site kwa na ndọta-n'agha, site kwa na nluta-n'agha, ọtutu ubọchi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 11