Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 1:13-21 Bible Nso (IGBOB)

13. Ka ahú kwa otú ayi di n'iru gi n'ile ayi anya, na otú umu-okoro ndi nēri ihe-oriri ọma eze di n'ile ha anya; ma dika i si hu, meso ndi-orù-gi otú a.

14. O we ge ha nti n'okwu a, we nwa ha ubọchi iri.

15. N'ọgwugwu ubọchi iri ewe hu na ha di nma n'ile ha anya, ha ma-kwa-ra abuba n'anu-aru, kari umu-okoro ahu nile ndi nēri ihe-oriri ọma eze.

16. Onye-nlekọta ahu we nēwepu ihe-oriri ọma ha na manya-vine ha ganāṅu, o we nēnye ha akukú.

17. Ma umu-okoro anọ ndia, Chineke nyere ha ọmuma-ihe na uche n'akwukwọ na amam-ihe nile: Daniel ghọta-kwa-ra ọhù na nrọ nile.

18. Ma n'ọgwugwu ubọchi ndia nke eze siri ka eme ka ha bata, onye-isi ndi-onozi we me ka ha bata n'iru Nebukadneza.

19. Eze we kpayere ha uka; ma ahughi n'etiti ha nile onye ọ bula di ka Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia: ha we guzo n'iru eze.

20. Ma n'okwu ọ bula nke amam-ihe nke nghọta, nke eze chọrọ n'aka ha, ọ huru na ha ka ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile na ndi-dibia nile ndi nọ n'ala-eze-ya nile nma ub͕ò iri.

21. Daniel we nọgide rue arọ mbu nke Sairọs, bú eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 1