Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 1:11-21 Bible Nso (IGBOB)

11. Daniel we si onye-nlekọta, nke onye-isi ndi-onozi mere ka ọ guru onye-isi Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia:

12. Biko, nānwa ndi-orù-gi ubọchi iri; ka ha nye kwa ayi akukú ufọdu, ayi ewe rie, ka ha nye kwa ayi miri, ayi ewe ṅua.

13. Ka ahú kwa otú ayi di n'iru gi n'ile ayi anya, na otú umu-okoro ndi nēri ihe-oriri ọma eze di n'ile ha anya; ma dika i si hu, meso ndi-orù-gi otú a.

14. O we ge ha nti n'okwu a, we nwa ha ubọchi iri.

15. N'ọgwugwu ubọchi iri ewe hu na ha di nma n'ile ha anya, ha ma-kwa-ra abuba n'anu-aru, kari umu-okoro ahu nile ndi nēri ihe-oriri ọma eze.

16. Onye-nlekọta ahu we nēwepu ihe-oriri ọma ha na manya-vine ha ganāṅu, o we nēnye ha akukú.

17. Ma umu-okoro anọ ndia, Chineke nyere ha ọmuma-ihe na uche n'akwukwọ na amam-ihe nile: Daniel ghọta-kwa-ra ọhù na nrọ nile.

18. Ma n'ọgwugwu ubọchi ndia nke eze siri ka eme ka ha bata, onye-isi ndi-onozi we me ka ha bata n'iru Nebukadneza.

19. Eze we kpayere ha uka; ma ahughi n'etiti ha nile onye ọ bula di ka Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia: ha we guzo n'iru eze.

20. Ma n'okwu ọ bula nke amam-ihe nke nghọta, nke eze chọrọ n'aka ha, ọ huru na ha ka ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile na ndi-dibia nile ndi nọ n'ala-eze-ya nile nma ub͕ò iri.

21. Daniel we nọgide rue arọ mbu nke Sairọs, bú eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 1