Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 1:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Onye-isi ndi-onozi we si Daniel, Mu onwem nātu egwu onye-nwem, bú eze, onye keputaworo ihe-oriri-unu na ihe-ọṅuṅu-unu: n'ihi na ọ̀ bú n'ihi gini ka ọ gāhu iru-unu ka ha b͕aruru kari iru umu-okoro ndi-ọb͕ọ-unu? unu ewe me ka eze nara isim na nrà.

11. Daniel we si onye-nlekọta, nke onye-isi ndi-onozi mere ka ọ guru onye-isi Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia:

12. Biko, nānwa ndi-orù-gi ubọchi iri; ka ha nye kwa ayi akukú ufọdu, ayi ewe rie, ka ha nye kwa ayi miri, ayi ewe ṅua.

13. Ka ahú kwa otú ayi di n'iru gi n'ile ayi anya, na otú umu-okoro ndi nēri ihe-oriri ọma eze di n'ile ha anya; ma dika i si hu, meso ndi-orù-gi otú a.

14. O we ge ha nti n'okwu a, we nwa ha ubọchi iri.

15. N'ọgwugwu ubọchi iri ewe hu na ha di nma n'ile ha anya, ha ma-kwa-ra abuba n'anu-aru, kari umu-okoro ahu nile ndi nēri ihe-oriri ọma eze.

16. Onye-nlekọta ahu we nēwepu ihe-oriri ọma ha na manya-vine ha ganāṅu, o we nēnye ha akukú.

17. Ma umu-okoro anọ ndia, Chineke nyere ha ọmuma-ihe na uche n'akwukwọ na amam-ihe nile: Daniel ghọta-kwa-ra ọhù na nrọ nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 1