Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Daniel 1:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. N'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Jehoiakim, bú eze Juda, ka Nebukadneza, bú eze Babilon, biara na Jerusalem, nọchigide ya n'agha.

2. Onye-nwe-ayi we were Jehoiakim, bú eze Juda, na ihe ufọdu nke ulo Chineke, nye n'aka-ya; o we chiri ha bia n'ala Shaina n'ulo chi-ya: ọ bu kwa ihe ndia ka ọ chibatara n'ulo àkù nke chi-ya.

3. Eze ahu we si Ashpenaz, bú onye-isi ndi-onozi-ya, ka o me ka ufọdu n'umu Israel bata, bú ufọdu nime nkpuru ala-eze na nime ndi-isi;

4. bú umu-okoro nke ọ dighi ọlu ọ bula di ha n'aru, ndi mara nma n'ile anya, nwe uche n'amam-ihe nile, mara ihe-ọmuma, nāghọta ihe anāma ama, ndi nwe-kwa-ra ike iguzo n'ulo uku eze; ọ si-kwa-ra ya ka o me ka ha muta akwukwọ na asusu nke ndi Kaldea.

5. Eze we keputara ha òkè nke ubọchi ọ bula n'ubọchi-ya site n'ihe-oriri ọma nke eze, na site na manya-vine nke ọ nāṅu, si ka eme ka ha toputa arọ atọ, ka ha we guzo n'iru eze n'ọgwugwu arọ atọ ahu.

6. Ma n'etiti ha ka umu Juda ufọdu di, bú Daniel, na Hananaia, na Mishael, na Azaraia.

7. Onye-isi ndi-onozi we gua ha aha: o we gua Daniel aha Belteshaza, gu kwa Hananaia aha Shedrak, gu kwa Mishael aha Mishak, gu kwa Azaraia aha Abed-nego.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Daniel 1