Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 9:8-21 Bible Nso (IGBOB)

8. Onye-nwe-ayi zigara okwu ba nime Jekob, o we dabà n'Iarael.

9. Ndi ahu gāma kwa, ha nile, bú Efraim na onye bi na Sameria, ndi nēkwu okwu nime npako na n'oké obi, si,

10. Brick adazuwo, ma nkume awara awa ka ayi gēji wu: eb͕utuzuwo osisi sycomore, ma osisi cedar ka ayi gētiye n'ọnọdu ha.

11. Ma Jehova nēme ka ndi nākpab͕u Rezin nọ n'elu imegide ya, Ọ nākwali kwa ndi-iro-ya;

12. Siria site n'Iru-anyanwu, na ndi Filistia site n'Ọdida-anyanwu; ha nēwere kwa ọnu nile richapu Israel. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

13. Ma ndi nka alaghachikuteghi Onye nētib͕u ha, ọ bughi kwa Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ha chọworo.

14. Jehova we nēbipu n'Israel isi na ọdudù, igu-nkwu na amì, n'otù ubọchi.

15. Okenye nke anāhu kwa iru-ọma, onye ahu bu isi; onye-amuma kwa nke nēzí okwu-ugha, onye ahu bu ọdudù.

16. Ndi-nduzi nke ndi nka we ghọ ndi nēme ka ha wagharia; ọzọ, ndi-ha anēduzi eduzi bu ndi anēloda eloda.

17. N'ihi nka Onye-nwe-ayi agaghi-aṅuri ọṅu n'aru umu-okorọbia-ha, Ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru umu-nb͕ei-ha na ndinyom-ha di-ha nwuru: n'ihi na onye ọ bula nime ha bu onye emeruru emeru na onye nēme ihe ọjọ, ọnu ọ bula nēkwu kwa ihe-nzuzu. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

18. N'ihi na nmebi-iwu erewo dika ọku; ogwu na uke ka o nērichapu: ọ nēnwu kwa ọku n'alughi-ulù nile nke oké ọhia, ha we kwulie elu na nkwuli-elu nke anwuru-ọku.

19. Nime nrubiga-ókè-iwe nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka erechapuworo ala: ndi nka we di ka nri ọku; onye ọ bula adighi-enwe ọmiko n'aru nwa-nne-ya.

20. O we b͕utue n'aka-nri, ma agu nāgu ya: ọ we rie ihe n'aka-ekpe, ma afọ ejughi ha: ha gēri, onye ọ bula anu-aru nke ogwe-aka-ya:

21. Manase gēmegide Efraim, Efraim gēmegide kwa Manase: ndi ahu abua gēmegide Juda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 9