Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 9:3-16 Bible Nso (IGBOB)

3. I mewo ka mba ahu ba uba, I mewo ka ọṅù diri ya uku: ha aṅuriwo n'iru Gi dika ọṅù nke di n'owuwe-ihe-ubi, dika madu si eteghari egwú ọṅù mb͕e ha nēkasa ihe akwatara n'agha.

4. N'ihi na yoke nke ibu-ya, na nkpa-n'aka nke ubu-ya, bú ndele nke onye nāchi ya n'ihe-ike, I nyajiwo ha, dika n'ubọchi nke Midian.

5. N'ihi na akpukpọ-ukwu ọ bula nke ndi-agha nēyi akpukpọ-ukwu n'ùzù agha, na uwe atururu n'ọbara, ha nile gābu ihe isure ọku, ọbuná nri ọku.

6. N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.

7. Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.

8. Onye-nwe-ayi zigara okwu ba nime Jekob, o we dabà n'Iarael.

9. Ndi ahu gāma kwa, ha nile, bú Efraim na onye bi na Sameria, ndi nēkwu okwu nime npako na n'oké obi, si,

10. Brick adazuwo, ma nkume awara awa ka ayi gēji wu: eb͕utuzuwo osisi sycomore, ma osisi cedar ka ayi gētiye n'ọnọdu ha.

11. Ma Jehova nēme ka ndi nākpab͕u Rezin nọ n'elu imegide ya, Ọ nākwali kwa ndi-iro-ya;

12. Siria site n'Iru-anyanwu, na ndi Filistia site n'Ọdida-anyanwu; ha nēwere kwa ọnu nile richapu Israel. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

13. Ma ndi nka alaghachikuteghi Onye nētib͕u ha, ọ bughi kwa Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ha chọworo.

14. Jehova we nēbipu n'Israel isi na ọdudù, igu-nkwu na amì, n'otù ubọchi.

15. Okenye nke anāhu kwa iru-ọma, onye ahu bu isi; onye-amuma kwa nke nēzí okwu-ugha, onye ahu bu ọdudù.

16. Ndi-nduzi nke ndi nka we ghọ ndi nēme ka ha wagharia; ọzọ, ndi-ha anēduzi eduzi bu ndi anēloda eloda.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 9