Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 8:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we sim, Were n'onwe-gi otù oké mbadamba ihe, ji kwa ihe madu ji ede ihe-odide dekwasi ya, Nka diri Maha-shalal-hash-baz;

2. M'gēme kwa ka ndi-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi nọrọm n'àmà, bú Uraia onye-nchu-àjà, na Zekaraia nwa Jeberekaia.

3. M'we bakuru nwunyem, bú amuma-nwanyi; o we turu ime, mua nwa-nwoke. Jehova we sim, Kpọ aha-ya Maha-shalal-hash-baz.

4. N'ihi na tutu nwata ahu amara ikpọ, si, Nnam, na, Nnem, agēbulaga àkù Damaskọs na ihe Sameria akwatara n'agha n'iru eze Asiria.

5. Jehova we gwakwam okwu ọzọ, si,

6. N'ihi na ndi nka ajuwo miri Shailoa nke nāga nwayọ, ma obi-utọ-ha di n'ebe Rezin na nwa Remalaia nọ;

7. ọbuná n'ihi nka, le, Onye-nwe-ayi nēme ka miri Osimiri rigokwasi ha, bú miri nke di ike di kwa ọtutu, ọbuná eze Asiria na ebube-ya nile: ọ gārigokwasi kwa ebe-ya nile miri si erù, rusa usọ-ya nile:

8. ọ gēruru kwa ba na Juda; ọ gēruchi, gabiga kwa; ọbuná n'olu ka ọ gēru; nsetipu nkù-ya abua gābu kwa ihe juputara obosara ala-gi, Immanuel.

9. Jọnu njọ, unu ndi di iche iche, ma agētipia unu; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile nọ n'ebe di anya nke uwa: kenu ihe n'úkwù-unu, ma agētipia unu; kenu ihe n'úkwù-unu, ma agētipia unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 8