Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 66:14-24 Bible Nso (IGBOB)

14. Unu gāhu kwa ya, o we tọ obi-unu utọ, ọkpukpu nile unu gējuputa na ndu dika ahihia ndu: agāma kwa aka Jehova n'ebe ndi-orù-Ya nọ, Ọ gēwesa kwa ndi-iro-Ya iwe.

15. N'ihi na, le, Jehova gēji ọku bia, ub͕ọ-ala-Ya nile gādi kwa ka oké ifufe; iji ọnuma nyeghachi iwe-Ya, na iji ire ọku nyeghachi ibasi-nba-ike-Ya.

16. N'ihi na ọku ka Jehova gēji soro anu-aru nile, bú madu, je ikpé, Ọ gēji kwa mma-agha-Ya: ndi Jehova b͕uworo gaba uba.

17. Ndi nēdo onwe-ha nsọ ndi nēme onwe-ha ka ha di ọcha ibà n'ubi nile ab͕ara ogige, n'azu otù onye di n'etiti, ndi nēri anu ezì, na ihe-árú ahu, na òké; n'otù ka ha gāgwusi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

18. Ma Mu onwem, amaram ọlu nile ha na èchìchè nile ha: mb͕e nābia ijikọta mba nile na asusu nile; ha gābia kwa, hu ebubem.

19. M'gēdo kwa ihe-iriba-ama n'etiti ha, si kwa n'etiti ha ziga ndi b͕aputara ab͕aputa ka ha jekuru mba nile, bú Tashish, na Pul, na Lud, ndi nādọ uta, jekuru Tubal na Jevan, jekuru agwe-etiti nile di anya, ndi nānughi ihe bayerem, ndi nāhughi kwa ebubem: ha gēgosi ebubem n'etiti mba nile.

20. Ha gēme kwa umu-nne-unu nile ka ha si na mba nile bia ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova, n'elu inyinya, na n'ub͕ọ-ala, na n'ub͕ọ-ala nwere ihe-okpukpu, na n'elu inyinya mule, na n'elu anu di ngwa, rue ugwu nsọm, bú Jerusalém, ka Jehova siri, dika umu Israel si ewebata onyinye-inata-iru-ọma-ha n'ulo Jehova n'ihe di ọcha.

21. Ọ bu kwa ufọdu nime ha ka M'gēwere ibu ndi-nchu-àjà na ibu ndi Livai, ka Jehova siri.

22. N'ihi na dika elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke Mu onwem nēme, ganēguzo n'irum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), otú a ka nkpuru-unu na aha-unu gēguzo.

23. Ọ gēru kwa, na site n'otù ọnwa ọhu rue ọnwa ọhu ọzọ, na site n'otù ubọchi-izu-ike rue ubọchi-izu-ike ọzọ, anu-aru nile, bú madu, gābia ikpọ isi ala n'irum, ka Jehova siri.

24. Ha gāpu kwa, lekwasi ozu nile nke ndi nējehie ejehie megidem: n'ihi na ikpuru-ha agaghi-anwu, ọku-ha agaghi-anyu kwa; ha gābu-kwa-ra anu-aru nile ihe isọ oyi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 66