Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 65:4-13 Bible Nso (IGBOB)

4. ndi nānọdu n'etiti ílì, nānọ kwa ọnọdu-abali n'ebe nile echebeworo na nzuzo; ndi nēri anu ezì, ofé nke ihe-árú di iche iche di kwa n'ihe-isi-ite nile ha;

5. ndi nāsi, Guzoro onwe-gi iche, abiarula nsom, n'ihi na edowom i ihe nsọ: ndia bu anwuru-ọku n'imim, ọku nke nēre ogologo ubọchi nile.

6. Le, ọ bu ihe edeworo n'akwukwọ n'irum: M'gaghi-agba nkiti, kama M'gākwughachi, e, M'gākwughachi n'obi-ha,

7. ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndi bu nna-unu n'otù, ka Jehova siri, bú ndi sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ugwu nile, takwam uta n'elu ugwu ntà nile: M'gēbu kwa uzọ tùa ọlu-ha n'obi-ha.

8. Otú a ka Jehova siri, Dika anāchọta manya-vine ọhu n'uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n'ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M'gēme N'ihi ndi-orùm, ka M'we ghara ibibi ha nile.

9. M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu.

10. Sheron gāghọ kwa ebe-ita-nri nke ìgwè ewu na aturu, ndagwurugwu Ekoa gāghọ kwa ebe ìgwè ehi nāmakpu amakpu. diri ndim chọworom.

11. Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n'usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa;

12. M'gāgukọta unu nye mma-agha, unu nile gēruru kwa ala ka ewe b͕ue unu; n'ihi na akpọrọm unu òkù, ma unu azaghm; ekwurum okwu, ma unu anughi; unu we me ihe jọrọ njọ n'anyam abua, ọ bu kwa ihe nke nātọghm utọ ka unu rọputara.

13. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji kwue otú a, si, Le, ndi-orùm gēri ihe, ma agu gāgu unu onwe-unu: le, ndi-orùm gāṅu, ihe-ọṅuṅu, ma akpiri gākpọ unu onwe-unu nku: le, ndi-orùm gāṅuri ọṅu, ma ihere gēme unu onwe-unu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Aisaia 65